Job 17

1Mmụọ m tiwara etiwa,
ụbọchị m niile dị mkpụmkpụ,
ili na-echere ịnabata m.
2Nʼezie ndị na-akwa emo gbara m gburugburu;
anya m na-elekwasịkwa mkpasu iwe ha.

3“Debere m ihe ebe nʼebe gị Chineke nọ.
Olee onye ọzọ pụrụ ịnara m nʼakaebe?
4I mechiela uche ha ka ha ghara inwe nghọta;
ya mere, i gaghị ekwe ka ha nwee mmeri.
5Ọ bụrụ na mmadụ ekwujọọ enyi ya ka o were nweta uru dị nʼime ya,
anya ụmụ ya ga-ada mba.

6“Chineke emeela ka m bụrụ okwu ilu nye onye ọbụla,
meekwa ka m bụrụ onye ha na-agbụsa asọ mmiri nʼihu.
7Anya m na-ahụ inyogho inyogho nʼihi iru ụjụ;
ahụ m aghọọla onyinyo nke ihe m bụ na mbụ.
8Ndị na-eme ihe ziri ezi na-akụja mgbe ha hụrụ nke a;
ndị aka ha dị ọcha na-enwe mkpali megide ndị ajọ omume.
9Ma otu ọbụla ọ dị, ndị ezi omume ga-aga nʼihu nʼiso ụzọ ha,
ndị aka ha dị ọcha ga-aga nʼihu nʼịdị ike.

10“Ma bịanụ, unu niile, bidonụ okwu unu ọzọ!
Agaghị m achọta onye maara ihe nʼetiti unu.
11Ụbọchị m niile agafeela, atụmatụ m abụrụla ihe lara nʼiyi.
Ma ọchịchọ nke obi m
12na-edo abalị nʼọnọdụ ehihie;
nʼihu ọchịchịrị ka ìhè dị nso.
13Ọ bụrụ na ebe obibi m na-ele anya ya bụ ili,
ọ bụrụ na m agbasaa
Maọbụ, atụsaa
ihe ndina m nʼelu ọchịchịrị,
14a sikwa na m asị ire ure, ‘Nna m ka ị bụ,’
maọbụ sị ikpuru ‘Nne m’ maọbụ ‘Nwanne m nwanyị,’
15ebeekwa ka olileanya m dị?
Onye pụrụ ịhụ ma m nwere olileanya?
16Olileanya m ọ ga-arịda ruo nʼọnụ ụzọ ama nke ọnwụ?
Anyị ga-esokọta rịdaruo nʼuzuzu?”
Copyright information for IboBIU